Igboists Forum - Nigerian Online Forum
Would you like to react to this message? Create an account in a few clicks or log in to continue.
Announcements

AKỤKỌ MAKA UMU ANUMANU

View previous topic View next topic Go down

IgboistReporter
IgboistReporter
Moderator
Moderator
Gender Gender : Female
Time Online : 3m 19s
State : Igboland
My Club My Club : Arsenal
Posts : 187 Posts Liked : 55

PostIgboistReporter Sat 07 Apr 2018, 6:39 pm

AKỤKỌ MAKA UMU ANUMANU Enwe10

AKỤKỌ IFO..

IFO CHAKPIII.... WOOOO

Otu ubochi, ogu dara n'etiti umu anumanu, ogu ahu dara n'etiti anu ndi bi n'elu na anu ndi bi n'ala. Ogu ahu siri ike nke ukwuu. Emesia, anu ndi bi n'ala manite
meriwe anu ndi bi n'elu. Mgbe usu huru nke a, o hapuru anu ndi otu ya bi n'elu ma gbakwuru anu ndi bi n'ala.

Mgbe izu ole na ole gasiri, anu ndi nke bi n'ala malitekwara meriwe anu ndi nke bi n'enu. Usu agbahapukwa anu ndi nke bi n'ala ma gbahachikwu anu ndi bi n'elu. Mgbe onwa iri na otu gasiri, umu anumanu nile ndi a weru gbakotakwa ma kpee udo n'etiti ha.

Mgbe ogu ahu biri, usu were gahachikwu anu elu ndi otu ya ma ha ekweghikwa anabata ya. O gakwuru anu ndi bi n'ala, ndi nke ahu were choo ya okpa elu ala. O bu ya kpatara usu abughi anu enu nke o ji abu anu ala wee ruo taa.....

Gịnị ka ị mụtara na akụkọ nke a????

Depụta ya..


Last edited by IgboistReporter on Sun 08 Apr 2018, 6:14 pm; edited 1 time in total
Anonymous
Ikenga
Guest

PostIkenga Sat 07 Apr 2018, 6:44 pm

mara ebe ikwu akwu
Anonymous
Nnenna
Guest

PostNnenna Sat 07 Apr 2018, 6:46 pm

ihe mutara na akuko ifo bu na ibu usu adiri Mama ikwu eziokwu Amaka nke ukwu
Anonymous
okey
Guest

Postokey Sat 07 Apr 2018, 6:47 pm

Odighi nma igba ozo ma ihe joora enyi gi njo
Anonymous
Iyke,,,
Guest

PostIyke,,, Sat 07 Apr 2018, 7:55 pm

Odighi mma ka ndi mmadu na-ahapu ndi otu ha maka nsogbu ha no na ime ya
Anonymous
Okoro
Guest

PostOkoro Sat 07 Apr 2018, 8:03 pm

Mmadu kwesiri ino ofu ebe na onudu obula
Anonymous
Nonso
Guest

PostNonso Sat 07 Apr 2018, 8:05 pm

Aghugho adighi nma ma ncha
Anonymous
Chinyere
Guest

PostChinyere Sat 07 Apr 2018, 8:15 pm

I ga- akwuriri ofu ebe. Ma o bughighi ya, gi noro ebe a noro ebe a. E nweghi ebe ikwuakwu cant hear u
Anonymous
Juliet Amara.
Guest

PostJuliet Amara. Sat 07 Apr 2018, 8:25 pm

Ihe m mutara bu na odighi mma mmadu I bu bu enyi soso mgbe ihe n'aga nk'oma, adighi mma
Anonymous
Ikenna
Guest

PostIkenna Sat 07 Apr 2018, 8:33 pm

Ihe m mutara bu na usu abughi anu elu,,obughi anu ala
Anonymous
Obasi
Guest

PostObasi Sat 07 Apr 2018, 8:44 pm

Kwuru ofu ebe name agbanyehi etu onodi di
Anonymous
Ego
Guest

PostEgo Sat 07 Apr 2018, 8:51 pm

Ihe nmutara bu na o di nma i guzosike na otu ihe na abughi nma iru abuo
Anonymous
Orji
Guest

PostOrji Sun 08 Apr 2018, 7:36 am

Ihe mutara bu JOY COMES IN THE MORNING. gbaranu beekee a.
Anonymous
Igbo
Guest

PostIgbo Sun 08 Apr 2018, 6:08 pm

Agam eji otu ilu wee kowaputa Ihe imuta m na-akuko iho anunwa...Ya bu..

"Mberede ka-eji ama dike"

Ihe ona-akowa wee buru, mmadu di ndu ekwesighi igbara Ihe biara ya ugwo,ogu maobu mgba oso,gbasie ukwu ike n'ala,ruo ogu maa gbakwa obala ole ike gi haa,na ikpe azu,iga aburiri onye melili
emeli.....

Ejighi ujo maobu igba oso ama dike kama obu "MBEREDE KA EJI AMA DIKE"
Hatch
Hatch
Super Moderator
Super Moderator
Time Online : 10m 18s
State : Ebonyi State
My Club My Club : Manchester United
Posts : 474 Posts Liked : 106
Awards :

PostHatch Sun 08 Apr 2018, 6:12 pm

AKỤKỌ MAKA UMU ANUMANU Enwe10
Agonarikwala umunne gị nagbanyeghi ọnọdụ ọbụla ha no.
Anonymous
Okagbue
Guest

PostOkagbue Mon 09 Apr 2018, 12:32 pm

Ihe mu mutara bu na mmadu ga enwe ndidi na ihe obuna ona eme MA obu onodu obuna ino tukwasi chukwu obi ma odi nma ma odi njo
Sponsored content

PostSponsored content

View previous topic View next topic Back to top

Create an account or log in to leave a reply

You need to be a member in order to leave a reply.

Create an account

Join our community by creating a new account. It's easy!


Create a new account

Log in

Already have an account? No problem, log in here.


Log in

 
Permissions in this forum:
You cannot reply to topics in this forum